Welcome, Guest: Register On Nairaland / LOGIN! / Trending / Recent / NewStats: 3,205,845 members, 7,993,930 topics. Date: Monday, 04 November 2024 at 10:08 PM |
Nairaland Forum / Nairaland / General / Politics / Ka M Lewe Ụwa M (509 Views)
Amb. Oji Ngofa Takes Message Of Hope To The Ancient Lewe And K-dere Community / Shege-Ka-Fasa: Northern Nigeria Security Outfit Launched (Photos) / Northern Groups Back Amotekun, Demand ‘Operation Shege Ka Fasa’ (2) (3) (4)
Ka M Lewe Ụwa M by stansaintly(m): 8:52am On Sep 29, 2019 |
KA M LEWE ỤWA M Achụọla m ọkpara Chụọ igurube E gwuola m mmiri ukwu Gwuokwa nke nta Sọsọ ka m hụ na m pụrụ ndụ Leenụ ndị mụ na ha so bido njem Ha agaruola kemgbe zuwe ike 'Ebe onye ọsọ rụrụ onye ije ga-eru ya' Bụ sọ nkasị obi m na-enye onwe m Mana kedụ mgbe oge nke m ga-eru? Chịma akpụọla ụlọ Emeka na-akwazi ezigbo ụgbọala Ọkwa Chike akpọrọla nwanyị mee ihe isi ya Ọgbọ m abachaala uru Kedụ onye ọfọrọ ma ọ bụghị m? Anwaala m oke m Mana onweghi ụzọ kwere ọgịga Ọgwụla sọ otu oghere ka m nwere Ịka obi tinye aka n'ihe ọjọọ Ma otu obi agaghị ekwe m M were ọbara gwọta ego Kedụ onye ga-eri ya bụ ego? M were apata m chụta ego Ọ bụ ihe ọma ka m meere onwe m? Chai!!! Ụwa m ntọọọ!!! Agaghị m akwụsị ịgba mbọ M lewe ndị ọzọ anya, m danye n'olulu Ụkwa ruo oge ya ọdaa Ka m ghara ịṅụ ngwo na nkwu na-abịa Ugo m gbuzuo, ọ ga-achakeriri Ụwa a bụ onye na nke ya. Odee: Ugochukwu Benedict Alugwe Satọdee, Sepụtemba 28, 2019. 6:05pm. 1 Like
|
Re: Ka M Lewe Ụwa M by Frankdoz5: 9:06am On Sep 29, 2019 |
Ndewo, igbaliri nke ukwuu. Ndi Igbo n' atu ilu si n' oge chineke ka mma. Biko chere oge nke gi. 1 Like |
Re: Ka M Lewe Ụwa M by gidgiddy: 9:15am On Sep 29, 2019 |
stansaintly: Okwu nkasi obi 1 Like 1 Share |
Re: Ka M Lewe Ụwa M by Nobody: 9:36am On Sep 29, 2019 |
Ndị chọọ i le ọgwụ na malay mor na southy, ka fa kpata ego ọsịsọ, bia ka unu gụọ ifa. |
Re: Ka M Lewe Ụwa M by Frankdoz5: 9:41am On Sep 29, 2019 |
Ardar:nwannw m, ana m akwadobe ibanye Indonesia, mana Ihe a m guru ugbu a akasachala m obi. |
Re: Ka M Lewe Ụwa M by Nobody: 9:47am On Sep 29, 2019 |
Frankdoz5: Agala ebe ahụ ịre ọgwụ o |
Re: Ka M Lewe Ụwa M by Frankdoz5: 9:47am On Sep 29, 2019 |
Biko umunne m on were ihe m choro iju unu. O nwere onye choro I banye obodo Tunisia nke di na mgbago ugwu Africa? O nwere onye nwere contact obodo ahu? |
Re: Ka M Lewe Ụwa M by Frankdoz5: 9:52am On Sep 29, 2019 |
Ardar:tufiakwaaaa! Chineke napu ekwensu Ike. Onyisi ala ndi Indonesia bu jaja widodo bu ekwensu ana ahu anya, o naghi emere ndi buru ogu ebere. Biko ana m eje ebe ahu I ga gu akwukwo dokinta. |
Re: Ka M Lewe Ụwa M by stansaintly(m): 9:55am On Sep 29, 2019 |
Frankdoz5: Ọ bụrụ na-onweghi onye inwere ebeaghu biko tụgharikwa uche nko oma tupu i hapu nsọụkwụ. Ndigbo tụrụ ilu si "ike nkwụcha abughị nwoke ụjọ |
Re: Ka M Lewe Ụwa M by Nobody: 9:56am On Sep 29, 2019 |
Frankdoz5: Ọ dị mma |
Re: Ka M Lewe Ụwa M by stansaintly(m): 10:06am On Sep 29, 2019 |
Ardar: Ada bekee, ya gaziere gi. Igbo kwuru okwu si "n'okenye anaghị anọ n'ulo ewu anwua n'ogbiri" Frank, ị ga achọta ihe ị chọ maka na ebe nwata n'ebe akwa arụ aka, ọbụrụ na nne ya anọghị ya nna ya ga anọriri ya |
Re: Ka M Lewe Ụwa M by Frankdoz5: 10:11am On Sep 29, 2019 |
stansaintly:iseeeee! O ga adikwuru unu nile mma o. |
Re: Ka M Lewe Ụwa M by mcbreeze: 10:40am On Sep 29, 2019 |
Nwanne jisie ike. O ga adiri gi na mma. |
(1) (Reply)
Breaking!!! Fire Outbreak At Balogin Market Lagos Island / REVEALED: Names Of Osinbajo’s Aides Fired By Buhari / Orji Kalu Visits Senator Benjamin Uwajumogu, Says Southeast Must Unite
Viewing this topic: 1 guest(s)
(Go Up)
Sections: politics (1) business autos (1) jobs (1) career education (1) romance computers phones travel sports fashion health religion celebs tv-movies music-radio literature webmasters programming techmarket Links: (1) (2) (3) (4) (5) (6) (7) (8) (9) (10) Nairaland - Copyright © 2005 - 2024 Oluwaseun Osewa. All rights reserved. See How To Advertise. 51 |