Welcome, Guest: Register On Nairaland / LOGIN! / Trending / Recent / New
Stats: 3,159,641 members, 7,840,562 topics. Date: Sunday, 26 May 2024 at 08:54 AM

A Kpọkuola Ndị Ntorobịa Ka Ha Were Ohere Ọma Dịịrị Ha Wee Kpọrọ Ihe - Culture - Nairaland

Nairaland Forum / Nairaland / General / Culture / A Kpọkuola Ndị Ntorobịa Ka Ha Were Ohere Ọma Dịịrị Ha Wee Kpọrọ Ihe (648 Views)

"Good Morning" Is Not "Ututu Ọma" / Ndị Arewa Ekwena Nkwa Ịkwado Obianọ Nke Ugboro Abụọ. By Izunna Okafor / Ihe Mere Na Nme-nme 'Ndigbo Nollywood Festival Of Art And Culture' (Foto) (2) (3) (4)

(1) (Reply)

A Kpọkuola Ndị Ntorobịa Ka Ha Were Ohere Ọma Dịịrị Ha Wee Kpọrọ Ihe by IzunnaOkafor(m): 7:57pm On Jul 13, 2018
Izunna Okafor Dere Akụkọ a


A kpọkuola ndị ntorobịa na steeti Anambra ka ha makụọ ma were ohere ọma dịịrị ha wee kpọrọ ihe ma baara onwe ha uru n'ihi na ohere ọma na-aga aga.
Aka na-achị steeti Anambra bụ gọvanọ Willie Obianọ kpọrọ oku a na nnukwu ihe mmemme pụrụ iche a kpọrọ izuụka "Digipreneur" nke ahọ 2018, bụ nke weere ọnọdụ n'Awka, ma bụrụkwa nke a chịkọbara site n'aka nnukwu onye enyemaka pụrụ iche nye gọvanọ Obianọ n'ihe gbasaara iwulite ndị ntorobịa na ọrụaka n'usoro ọgbara ọhụụ digitalụ, bụ maazị Ifeanyị Anịagọ , na njikọaka nke ya na ministịrị steeti ahụ na-ahụ maka ịkwalite ndị ntorobịa na ọnọdụ akụnụba nke ihe e ji aka eme.
Ka ọ na-agwa imirikiti mmadụ bịara mmemme ahụ okwu, gọvanọ Obianọ, nke onye nọchitere anya ya bụ osote ya, dọkịnta Nkem Okeke mere ka a mara na ohere dị iche iche na ezi olile anya dịịrị ndị ntorobịa steeti Anambra iji bụrụ ndị e ji ama atụ n'ala anyị, n'ihi ọtụtụ atụmatụ dị iche iche a na-atụpụtasị iji nye ha ezi nkuzi na nkwàdo zuru oke ha chọrọ. O chetaara ndị bịara ọgbakọ ahụ na ọtụtụ ndị dike e jiri mara steeti Anambra, nke gụnyere dọkịnta Nnamdị Azikiwe lagoro mmụọ, ọkammụta Chịnụa Achebe lagoro mmụọ, nwaada Chimamanda Adịchie na ọtụtụ ndị ọzọ, bụgbado ndị gbara mbọ ma mepụta ihe a hụrụ anya oge ha ka bụ ndị ntorobịa, na-agbanyeghị na ụdị ohere dị ugbu a adịrịghị ha no oge nke ha.
Dọkịnta Okeke gara n'ihu tòó ma mee ka a mara na ọchịchị nọ ugbu a na steeti ahụ bụ nnọọ nke nwere ezi mmasị n'ebe ndị ntorobịa nọ, n'ihi na ọ bụghị naanị na ọ bụ gọvanọ kachara nwee ọnụ ọgụgụ ndị ntorobịa n'ọchịchị ya, n'ụdị nke a na-ahụtubeghị na steeti ọbụla n'ala Naịjiria, kama ọ na-agakwa n'ihu ime ka ha guzosie ike n'ịkwụrụ onwe ha site n'atụmatụ inye ha nkuzi dị iche iche nakwa inye ha nkwàdo n'ụzọ pụrụ iche iji bụrụ mmadụ na ndụ. O kwezịkwara nkwa na n'oge adịghị anya, ọchịchị steeti ahụ ga-eziga ndị ntorobịa ruru iri n'ọnụ ọgụgụ ka ha gaa mba Austria ga gụọ akwụkwọ n'efu. O tokwara ndị chịkọbara ya bụ mmemme maka ezi atụmatụ dị otu ahụ, ma dụọ ndị ntorobịa ka ha sonyesie ike nke ukwuu.
Na mbụ n'ozi nnọọ ya n'ụbọchị mbụ nke nkuzi ahụ were abalị atọ, ya bụ nwa amadi chịkọbara oke mmemme ahụ ma bụrụkwa nnukwu onye enyemaka pụrụ iche nye gọvanọ Obianọ n'ihe gbasaara iwulite ndị ntorobịa na ọrụaka n'usoro ọgbara ọhụụ digitalụ, bụ maazị Ifeanyị Anịagọ kọwara na ebumnobi ọgbakọ ahụ bụ iji wee mee ka ndị mmadụ, ọ kachasị ndị ntorobịa mara ohere dị iche iche dị na usoro ọgbara ọhụụ dijitalụ, nye ha nkuzi otu ha ga-esi malite irita uru na ya bụ ohere ọma, ma nyekwa ha nkwàdo kwesiri ekwesi iji wee màlite, kwụrụ onwe ha ma nwekwa ike ịkuziri ndị ọzọ.
Na nkọwa ya, o kwuru na ya bụ ọkpụrụkpọ okwu bụ "Digipreneur" pụtara mmadụ iji usoro ọgbara ọhụrụ dijitalụ wee mere ọrụ aka dịka onye kwụụrụ onwe ya, ma kwuo na ha chọrọ isi n'ọgbakọ nkuzi ahụ bèlata enweghị ohere ọrụ, belata agụụ na isi n'usoro dijitalụ ezu ohi ego, kwalite ezi ọnọdụ nchekwa ma wulitekwa ọnọdụ obibi ndụ na ọnọdụ akụnụba ụmụ mmadụ na steeti ahụ.
Ọ kpọkuzịkwara ndị bịara ọgbakọ ahụ ka onye ọbụla n'ime ha gbaa mbọ ịhụ na ọ gaghị anọchaa ebe ahụ gbara aka laa, ọbụnadị dịka ụfọdụ ndị isi ụlọ ọrụ a ma ama bịara ọgbakọ ahụ kwegoro ọtụtụ nkwa inye ọtụtụ ndị ntorobịa kachara wee sonyesie ike n'ihe ọmụmụ ahụ ihe nrita dị iche iche na iwekwa ọtụtụ n'ime ha n'ọrụ n'ụlọ ọrụ ha, ebe ya onwe ya kwegokwara gọvanọ Obianọ nkwa na tupuu ọnwa ekeresimesi, na ọ ga-azụpụta, o pekata mpe, ndị ntorobịa iri ise ga-enwe nde kwuru ndè ego (fifty millionaire).
Na ntụnye ha n'otu n'otu, kọmishọna steeti ahụ na-ahụ maka ịkwalite ndị ntorobịa na ọnọdụ akụnụba nke ihe e ji aka eme, bụ maazị Bonaventure Enemali; onyeisi ụlọ ọrụ "Stanel World" bụ maazị Stanley Ụzọchukwu bụ ndị mere ntụnye dara ụda n'ịkwàdo ihe mmemme ahụ kwuru n'eziokwu na ihe mmemme dị otu ahụ kwesiri nkwàdo, kọwaa steeti Anambra dịka ndị na-agba ndị nke mbụ n'ịkwàdo na itinye ndị ntorobịa n'ọrụ, ma kpọkuziekwa ndị bịara ọgbakọ ahụ ka ha kpara ya bụ ọjị nkụ maka na a dịghị arị ọjị kwadaa.
N'okwu ha kwa n'otu n'otu, kọmishọna steeti ahụ na-ahụ maka gburu gburu, bụ maazị Mike Okonkwọ; onyeisi ụlọ mgbasa ozi 'Anambra Broadcasting Service', bụ Nze Uche Nwọrah; ògbò ya nke ụlọ mbipụta akwụkwọ akụkọ National Light, Ka Ọ Dị Taa na Light Sports Extra, bụ Sa Chuka Nnabụife; nnukwu onye enyemaka pụrụ iche nye gọvanọ Obianọ n'ihe gbasaara amụmà ahụ ike, bụ maazị Dozie Ọkpalaugo, kọwara ọgbakọ nkuzi ahụ dịka nke bịara n'oge ya n'ihi na ihe niile n'ụwa na-agazịkwa n'usoro ọgbara ọhụụ dijitalụ, ebe ha onwe ha na ụlọ ọrụ ha malitegokwara itinye usoro dijitalụ n'ihe dị iche iche ha na-eme, ma dụkwazie ụmụ na-eto eto ka ha were ohere ọma baara onwe ha uru.
Ndị ọzọ nyere nkuzi n'ọgbakọ ahụ, nke gụnyere maazị Celestine Achị , bụ onyeisi ụlọ ọrụ DigitalPR-Wire; maazị Peter Olukaigwe, bụ onye ndezi Techonomy; eze ọdịnala Ifitedunu, bụ Igwe Emeka Iloụnọ na ọtụtụ ndị ọzọ mepezịkwara anya ndị bịara mmemme ahụ ka ha hụ ohere ọma dị iche iche jupụtara n'usoro ọgbara ọhụụ dijitalụ, ebe onye chịkọbara ọgbakọ ahụ, bụ maazị Ifeanyị Anịagọ mere ka a mara na a ga na-enwe nnukwu ọgbakọ ọzọ pụrụ iche kwa ọnwa ọbụla ebe a ga akpọ ụmụafọ ala anyị na-ewu ewù ka ha bịa nye ndị ntorobịa ruru otù puku nkụzi ma kọọrọ ha akụkọ otu ha siri malite na otu ha siri bụrụ mmadụ.
Na nchịkọta ọgbakọ ahụ, e nyere ndị ntorobịa karịrị iri ise n'ọnụ ọgụgụ nkwàdo gburu ego karịrị ndè naịra abụọ iji malite ihe dị iche ha chọrọ ịmalite n'usoro dijitalụ.
Ndị ọzọ kwuru okwu na mmemme ahụ gụnyere ọtụtụ ndị ọrụ gọọmenti dị iche iche, nke gụnyere: Maazị Ọbasị Innocent, maazị Adịnụba P.C; maazị Onyebụchi Dike; maazị Emmanuel Okoye; maazị Chike Iwoba; maazị Tobenna Obianọ; maazị Anyaeche Somtoo; maazị Okechukwu Mkparụ; maazị Ifemene Oreke na imirikiti ndị ọzọ.

(1) (Reply)

"Imported Mentality"- Is It A Problem? / Is There Yoruba Quarters And Kings In The Northern States? / Is It Truly Important To Know Your Mother Tongue?

(Go Up)

Sections: politics (1) business autos (1) jobs (1) career education (1) romance computers phones travel sports fashion health
religion celebs tv-movies music-radio literature webmasters programming techmarket

Links: (1) (2) (3) (4) (5) (6) (7) (8) (9) (10)

Nairaland - Copyright © 2005 - 2024 Oluwaseun Osewa. All rights reserved. See How To Advertise. 17
Disclaimer: Every Nairaland member is solely responsible for anything that he/she posts or uploads on Nairaland.