Welcome, Guest: Register On Nairaland / LOGIN! / Trending / Recent / New
Stats: 3,201,114 members, 7,977,217 topics. Date: Wednesday, 16 October 2024 at 10:24 PM

A Kpokupla Ndị Anambra Ka Ha Makụọ Otu Ndọrọ Ndọrọ APGA - Culture - Nairaland

Nairaland Forum / Nairaland / General / Culture / A Kpokupla Ndị Anambra Ka Ha Makụọ Otu Ndọrọ Ndọrọ APGA (484 Views)

Udummiri: Ndị Ebenatọ Arịọ Enyemaka Gọọmenti Maka Mbize Ha / A Kpọkuola Ndị Ntorobịa Ka Ha Were Ohere Ọma Dịịrị Ha Wee Kpọrọ Ihe / Ndị Arewa Ekwena Nkwa Ịkwado Obianọ Nke Ugboro Abụọ. By Izunna Okafor (2) (3) (4)

(1) (Reply)

A Kpokupla Ndị Anambra Ka Ha Makụọ Otu Ndọrọ Ndọrọ APGA by IzunnaOkafor(m): 7:27am On Jun 21, 2018
Izunna Okafọr dere akụkọ a

A kpọkuola ụmụafọ steeti Anambra na ndị Igbo gbaa gburu gburu ka ha makụọ, bata ma were otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị APGA dịka otu ndọrọ ndọrọ ha n'ihi ezi ọdịnihu, ịdị n'otu na agamnihu nke ahụ ga-ewetere ha.
Otu nnukwu mmadụ e ji okwu ya agba ìzù ma bụrụkwa onye selitere is n'otu ndọrọ ndọrọ ahụ, bụ Chiifu Chris Nwachukwu (O buru O Tie) kpọrọ oku a ụbọchị ụka gara aga na nnukwu ọgbakọ ọ chịkọbara na be ya dị n'Umuhu Ụkpọr n'okpuru ọchịchị Nnewi Sawụtụ nke steeti Anambra, ma bụrụkwa nke dọtara imirikiti mmadụ sitere n'ebe dị iche iche nakwa otu ndọrọ ndọrọ dị iche iche wee bịa.
Ka ọ na-agwa ọhaneze bịara ọgbakọ ahụ okwu, maazị Nwachukwu mere ka a mara na ebumnobi mbụ nke ọgbakọ ahụ bụ ka o were ohere ahụ kelee ìgwè mmadụ ndị ahụ maka nkwàdo ha nyere gọvanọ Willie Obianọ na otu ọtụtụ n'ime ha siri tụnyere ya na nhọpụta ọkwa gọvanọ e mere n'ahọ gara aga nke mere ka o nweta mmeri dara ụda n'okpuru ọchịchị iri abụọ na otu e nwere na steeti. Ya bụ na ọ chọrọ ka o were ohere ahụ wee lee ha ọrụ.
N'aka nke ọzọ, o kwuru na ihe ọzọ bụkwá isi sekpụ ntị n'ọgbakọ ahụ bụ ka ọ kọwaara ha ezi mkpa ọ dị ịhụ na ha, bụ ndị Anambra na ụmụafọ Igbo n'ozuzu oke bịara sonye n'otu ndọrọ ndọrọ APGA, iji hụ na ebumnobi ha banyere ezi ọchịchị, ịdị n'otu na ọganihu ndị Igbo ga-abụ nrọ pụtara ihè maka na a dịghị ahapụ egwu n'ụlọ gbaa n'ama. Ọ kọwara otu ndọrọ ndọrọ APGA dịka ụgbọ na-aga aga, otu ndọrọ ndọrọ nwere ihe ọ ga-ewe iji weta ezi ọchịchị n'ala anyị, nakwa otu ndọrọ ndọrọ pụrụ ime ka ndị Igbo soro n'ihe a na-eme ma nwee ọnụ okwu n'ala Nigeria.
Ọ kpọpụtasịịrị ha ọtụtụ ọrụ ọma dị iche iche gọvanọ Willie Obianọ ji n'aka na ihe ndị ọzọ o mepụtagoro na ngalaba ọrụ mmepe, ọrụ ugbo, nchekwa, mmepe ime ime obodo na ngalaba ndị ọzọ dị iche iche, ma kwuo hoohaa nke ahụ emeela ka steeti Anambra bụrụ steeti e ji ama atụ ma n'ala Nigeria ma na mba ofesi. O mezịrị ka a mara na ọrụ ọma ndị ahụ niile bụ nke na-egosi n'ezie na APGA nwere ebe ọ na-elegara anya ma bụrụ otu ndọrọ ndọrọ e ji ama atụ n'ihe gbasaara ezi ọchịchị n'ala anyị. O cheteere ha na onye ọbụla bụ nwaafọ Anambra eritela otu uru ma ọ bụ nke ọzọ site n'ezi ọchịchị nke gọvanọ Obianọ, ma kpọkuziekwa ha ka ha metụ aka n'obi bata n'otu ndọrọ ndọrọ ahụ bụ ụgbọ na-aga aga ma na ọ dịghị mma mmadụ hụchaa ebe a na-echi ọzọ gaba ebe a na-arụ agwụ.
Ihe pụtakarịchara ihè na ọgbakọ ahụ bụ ịnabata imirikiti mmadụ ndị nọrọ n'ebe ahụ kpebie ozigbo ma bata n'otu ndọrọ ndọrọ APGA dịka ha tụlere nke ọma wee chọpụta n'ezie na nke ahụ bụ ezinaụlọ ndị Igbo.

1 Share

(1) (Reply)

For Forget 2019 Election In Our Land - Biafran / When The Ancestors Are Hungry! / To The Dead

(Go Up)

Sections: politics (1) business autos (1) jobs (1) career education (1) romance computers phones travel sports fashion health
religion celebs tv-movies music-radio literature webmasters programming techmarket

Links: (1) (2) (3) (4) (5) (6) (7) (8) (9) (10)

Nairaland - Copyright © 2005 - 2024 Oluwaseun Osewa. All rights reserved. See How To Advertise. 12
Disclaimer: Every Nairaland member is solely responsible for anything that he/she posts or uploads on Nairaland.