Welcome, Guest: Register On Nairaland / LOGIN! / Trending / Recent / New
Stats: 3,171,944 members, 7,883,292 topics. Date: Monday, 08 July 2024 at 08:23 AM

Ide Mmiri Agbàgbuola Mmadụ Anọ N'ọnịsha, Mee Mkpamkpa N'okpoko - Culture - Nairaland

Nairaland Forum / Nairaland / General / Culture / Ide Mmiri Agbàgbuola Mmadụ Anọ N'ọnịsha, Mee Mkpamkpa N'okpoko (580 Views)

Ndị Ukpor Ewere Oke Ọñụ Mee Ụbọchị Ụkpọr / Anya Mmiri Ala Anyị (the Tears Of Our Land) / Meaning Of Nyamiri (nye M Mmiri): "Give Me Water." (2) (3) (4)

(1) (Reply)

Ide Mmiri Agbàgbuola Mmadụ Anọ N'ọnịsha, Mee Mkpamkpa N'okpoko by IzunnaOkafor(m): 12:07pm On Jul 07, 2018
Igbo News Written By Izunna Okafor


Nnukwu ihe egwu dara nnọọ n'Ọnịsha, steeti Anambra, n'izuụka gara aga, dịka oke idè mmiri gbàgburu mmadụ anọ ndị ọrụ ụlọ akụ ma tigwosiekwa ọtụtụ ụgbọ ala, n'ihi ike mmiri ozuzo kwọsịrị n'obodo ahụ, bụkwa nke zoro ọtụtụ awà.
Mmadụ anọ ahụ, ndị a kọwara dịka ndị na-arụ n'otu ụlọ ọba ego dị na mpaghara ahụ, bụ ndị e kwuru na ha chegidere ka mmiri ozuzo ahụ kwụsị ma ọ chọghị ịkwụsị wee rukwaa oge ha mechiri ọrụ, nke mezịrị ka ha kpebie ibu ya wee laa; ha anọ wee bàkọọ otu ụgbọala, bụkwazị nke oke ide mmiri buchaara n'okporo ụzọ oge ha na-ala, ma sụnye ya isi n'otu ọwà mmiri chere ihu n'ohimiri Niger, ebe ha nọzịrị wee ghọrọ ozu.
Dịka otu onye ọnọ mgbe o mere siri kwuo, mmadụ anọ, tinyere otu nwata nwaanyị bụ ndị a hụrụ n'ime ụgbọala ahụ ka ha nọ n'egwù ma na-agbakarị ala ịzọta onwe ha n'ihi na ide mmiri ahụ asachiela iro niile, mana o nweghị ihe ha pụrụ imeta banyere nke ahụ, wee ruo oge ọ sụnyere ha isi n'ọwà mmiri ahụ, bụ nke ímì ya ruru ihe dịka fiiti iri na ise.
Ka ọ dị ugbu a, e bubutala ụgbọala ahụ ma nweta ozu mmadụ anọ, ma ozu nwatakịrị nwaanyị ahụ bụ nke a na-ahụghị, ebe ndị mmadụ na-ekwu na e leghị anya, ọ bụrụ na mmiri buuru ya gbadaa ohimiri Niger, bụ ebe ọ nọzịrị wee funyụọ anya.


N'okwu dịkwa ka ibe ya, oke egwu dakwara n'Okpoko dị n'okpuru ọchịchị Ọgbaru na steeti Anambra n'isi ngwụcha izuuka ahụ, dịka oke ide mmiri wakporo obodo ahụ ma bibie ọtụtụ ihe gburu nde kwuru nde naịra, dịka eluigwe kwughepuru ụbọchị ahụ. Ihe ndị ahụ mmiri bibìri gụnyere ụlọ akwụkwọ na ụlọ mmadụ, ebe oke iju mmiri hubatakwara n'ime ụlọ ọtụtụ ndị, wee derìsie ihe ha jiri biri.
N'ajụjụ ọnụ a gbara ya, osote onyeisi otu ụlọ akwụkwọ ide mmiri ahụ metụtara, bụ oriakụ Helen Ọhaemesi kwuru na ya bụ mwakpo ide mmiri na-achọzị ịbụ omenahọ n'ihi na kwa ahọ ọbụla, ụdị ihe ahụ na-adakwasị ha. O mere ka a mara na ide mmiri ahụ kwaturu ogige ụlọakwụkwọ ahụ, ma bibìsie ọtụtụ akwụkwọ na ihe ndị ọzọ ha ji arụ ọrụ, ma kpọkuzie gọọmenti steeti ahụ ka ọ gbatara ha ọsọ enyemaka, n'ihi na nke a mere n'isi mbido udu mmiri egosila ha ihe akaghị ime ma a batazie n'etiti ọnwa mmiri kpọmkwem.
Ụfọdụ ndị e ji okwu ha agba izu n'obodo ahụ, nke gụnyere maazị Benson Nwawulu, bụ onye na-anọchite anya ọgbọ nta nkwàdo Ọgbaru nke abụọ n'ụlọ ọgbakọ omebe iwu steeti Anambra, na maazị Ephraim Mmadụ, bụ onye nọ n'agbata gọvanọ steeti ahụ na ndị obodo ahụ kwuru na iji ahịhịa sụchie ọwa mmiri so n'otu ihe kpata ide mmiri ahụ jiri kawanye njọ, kpọpụtasịa ụfọdụ mbọ dị iche iche ndị obodo ahụ gbagoro n'onwe ha iji weta ọnọdụ ọjọọ ahụ n'isi njedobe, kpọkuo ụmụafọ obodo ahụ ka ha kwụsị ịwụnye ahịhịa n'ọwà mmiri, ma kpọkuziekwa gọọmenti steeti ahụ ka ọ gbatara ha ọsọ enyemaka n'imemila ọnọdụ ahụ na idozi ihe ndị ide mmiri ahụ mebisigoro

1 Like

Re: Ide Mmiri Agbàgbuola Mmadụ Anọ N'ọnịsha, Mee Mkpamkpa N'okpoko by Betakeshi: 8:05pm On Jul 07, 2018
Thank you Google.... grin


A great threat has occurred in Osama, the state of Anambra, last week, as a huge flood shot by four bank personnel and a large number of cars, due to the rains of rainfall, the city, which also concealed many ranges.
The four people, described as executives of a local monetary house, who were said to have kept track of the rains and did not want to stop and to finish their work, which eventually ended up with them. decide to carry it and leave; four of them loaded up a car, as well as a flood flood on the road along the road, and hanged it on a waterfront bridge facing Niger, where they later became dead.
According to a reporter, four people, including a girl who had been found in the car, were in constant fear and often found shelter in the car because the flood flooded all the wounds. , but they can not afford anything about that, until they reach the head of the pool, which is about fifteen feet wide.
Meanwhile, the car has been hit and four bodies have been recovered, but the girl's body is unseen, where people say it is unlikely to be drowned to the nearest Niger border. where he was finally surprised.


In a similar statement, a massive terror broke out in the state of Anambra state on the weekend, as the flood hit the city and destroyed hundreds of millions of dollars, as the sky dropped. that day. The flood floods include schools and homes, and floods flood in many homes, and they break down their living space.
In an interview, the deputy director of the flooding hospital, Helen Helen's Hospital, said that it was an invasion of floods that required to be common because each year, such a thing was happening to them. He noted that the floodwaters demolished the campus, but destroyed several books and other materials, and called the state government for relief, because this happened at the outset. rainy seasons have shown less to the effect when it is dropped within the very middle of the month.
Some stakeholders, including President Nwawulu, who was representing the Second Youth War party in the state of Anambra state, said the man, Ephraim Man, state governors and local residents said that the use of recycling of waterways in one of the areas contributes to the deterioration of the flood, disseminating some of the various approaches that the people had climbed to themselves to bring the worst conditions to the head In addition, invites the villagers to stop installing grasshoppers in the river, and then invites the state government to assist them in refining the situation and repairing flood pollution
( Quote ) ( Report ) 1 Like ( Like )( Share )

(1) (Reply)

Osu And Ohu / Instead Of Suit & Tie, Man Takes His Bride To The Altar Wearing Isi Agụ (photos) / Why Isnt Nigera A Great Country Yet

(Go Up)

Sections: politics (1) business autos (1) jobs (1) career education (1) romance computers phones travel sports fashion health
religion celebs tv-movies music-radio literature webmasters programming techmarket

Links: (1) (2) (3) (4) (5) (6) (7) (8) (9) (10)

Nairaland - Copyright © 2005 - 2024 Oluwaseun Osewa. All rights reserved. See How To Advertise. 19
Disclaimer: Every Nairaland member is solely responsible for anything that he/she posts or uploads on Nairaland.