Welcome, Guest: Register On Nairaland / LOGIN! / Trending / Recent / NewStats: 3,186,353 members, 7,929,114 topics. Date: Friday, 23 August 2024 at 09:20 AM |
Nairaland Forum / Nairaland / General / Culture / Ehi Igbo (759 Views)
(1) (Reply)
Ehi Igbo by IzunnaOkafor(m): 4:17pm On Aug 05, 2019 |
Si n'aka Izunna Okafor Pòkòpòkò ka ọ na-ézè N'anya Chukwu na n'anya mmadụ Ihe dị mma na anya gbàrà Ị hụkwàrà anụ na mma Ehi Igbo ka ọ bụ. Lekene ụyọkọtọ ara ya Na àkpàkwùrù amụ ndị bụ óké Ìtè afọ ya, na àpàtà ụkwụ ya Ihe ndị a niile bụcha anụ anụ Ehi Igbo ka ọ bụ. Ọ naghị achọ nwoke okwu Nke o ji achọ nwaanyị Ọ naghị ebíbì ihe a kọrọ n'úgbō Ma ya fọdụzie ịràkọ mmadụ na onye nwe ya Ehi Igbo ka ọ bụ. Ehi Igbo anaghị eri óké egō Mana úrù ya kàrịrị nke ndi ngō Ịzụ ya anaghị ewèta ihe arụ Maka na onye nwe ya ñụjùrù mmiri ara afọ Ehi Igbo ka ọ bụ. Ehi Igbo na-amụ nwa juru eju Ụmụ ya na-etokwa ọsọọsọ Ehi Igbo na-agba óké anụ Anụ ya bụkwa ezigbo ihe ụtọ Ehi Igbo ka ọ bụ Ehi Igbo anaghị anwụ hịam Dịka nke ndị ngō Ọ bụghị ọrịa niile na-atụkwa ya Maka na onye nwe ya ma ihe o jìrì zụọ ya Ehi Igbo ka ọ bụ Ehi Igbo achọghị AK47 Ehi Igbo achọghịkwa RUGA Maka na agbụgbọ dị ya ahụ mma Ehi Igbo bụ anụ ụlọ Ehi Igbo ka ọ bụ Ehi Igbo na mmadụ anaghị akwàkọ iko Maka na nke ahụ bụ ihe arụ Ehi Igbo anaghị àwá isi Okwu na ụka abụghịkwa njirimara ya Ehi Igbo ka ọ bụ. Ehi Igbo dị mfé ọkpụkpa Ehi Igbo na-agbasi ike Ehi Igbo na-adị ọcha Ehi Igbo bụkwa sọ mma Ehi Igbo ka ọ bụ. Ụmụ Igbo zụbanụ ehi Igbo Ụmụ Igbo ribenụ ehi Igbo Maka na nke a bụ nke anyị Ehi Igbo atọgbuo m Kpọọ nụ ya ehi Igbo... Ehi Igbo... ©Izunna Okafor, 2019. 1 Like
|
(1) (Reply)
Wonders Of Bitter Kola; People Don't Even Know / Pre-colonial Traditional Architectures Of Nigeria / Art Cathey-40% Of African Women Bleach And 77% Of Nigerian Women Bleach
(Go Up)
Sections: politics (1) business autos (1) jobs (1) career education (1) romance computers phones travel sports fashion health religion celebs tv-movies music-radio literature webmasters programming techmarket Links: (1) (2) (3) (4) (5) (6) (7) (8) (9) (10) Nairaland - Copyright © 2005 - 2024 Oluwaseun Osewa. All rights reserved. See How To Advertise. 7 |