Welcome, Guest: Register On Nairaland / LOGIN! / Trending / Recent / New
Stats: 3,182,142 members, 7,916,343 topics. Date: Friday, 09 August 2024 at 09:03 PM

Nrurita Uka (debate In Igbo Language). - Culture - Nairaland

Nairaland Forum / Nairaland / General / Culture / Nrurita Uka (debate In Igbo Language). (17609 Views)

Benin Bronze Cockerel Causing Debate Between England & Nigeria (PHOTO) / Uka Alakoba N'ime Ala Igbo / Igbo Language And Nigerian Pidgin (2) (3) (4)

(1) (2) (Reply) (Go Down)

Nrurita Uka (debate In Igbo Language). by AndreUweh(m): 7:24pm On Dec 05, 2010
Nrurita uka bu okwu na-adi n'etiti mmadu abuo ma obu otu abuo (two groups).
Re: Nrurita Uka (debate In Igbo Language). by AndreUweh(m): 7:27pm On Dec 05, 2010
Biko, umu Igbo ndi nairaland, ka anyi nwe nruritauka (na i kwenyere ma o bu na i kwenyeghi) na obibia ndi ocha biara n'ala Igbo bara anyi uru, obughi oghom.
Re: Nrurita Uka (debate In Igbo Language). by ChinenyeN(m): 8:04pm On Dec 05, 2010
Gini bu "oghom"?
Re: Nrurita Uka (debate In Igbo Language). by AndreUweh(m): 8:12pm On Dec 05, 2010
ChinenyeN:

Gini bu "oghom"?
Oghom bu ihe ndi bekee na akpo: Disadvantage, hindrance or obstacle.
Re: Nrurita Uka (debate In Igbo Language). by ChinenyeN(m): 8:29pm On Dec 05, 2010
I meela. E nweghi ike iju si na obibia ndi ocha biara abaghi anyi uru o bula, ma elechakwa ya anya agaghi m ekwe na obibia ha biara dichara anyi nma.
Re: Nrurita Uka (debate In Igbo Language). by Obiagu1(m): 8:52pm On Dec 05, 2010
M ga ene ya anya n'uzo na abu. O bara anyi uru maka o kuziri anyi ka esi agu ede. Mepekwa anya anyi n'ihe gbasara nka na uzu.
Ihe ohom di na ya bu na ha kpokotara anyi na ndi Yoruba na ndi aboki onu ka anyi gbusisibe onwe anyi.
Re: Nrurita Uka (debate In Igbo Language). by NnamdiN: 9:01pm On Dec 05, 2010
Nwanne oma, obibia ndi ocha biara n'ala Igbo enweghi uru o bara anyi. O buru na a hapuru anyi, k'anyi jiri aka anyi dozie Obodo anyi, Ikwu eziokwu, ebe anyi no ugbua agari ibu ebe anyi no ugbua. BIKO ATUGHARIKWALA OKWU ANYI A N'OLU BEKEE, KA NDI ITI A JURU EBE A, GHARI IGHOTA IHE ANYI N'EKWU, kama inwere ike ikowara nwa afo obula ihe gbawojuru anya.
Re: Nrurita Uka (debate In Igbo Language). by NnamdiN: 9:08pm On Dec 05, 2010
Obiagu1:

M ga ene ya anya n'uzo na abu. O bara anyi uru maka o kuziri anyi ka esi agu ede. Mepekwa anya anyi n'ihe gbasara nka na uzu.
Ihe ohom di na ya bu na ha kpokotara anyi na ndi Yoruba na ndi aboki onu ka anyi gbusisibe onwe anyi.
nwanna, ife I n'asu bu asusu ndi be anyi, biko fa nweli ike ghali ighota cha ya ofuma, biko gbaniya jiri central asusu ka mmadu nine nwe ike ighota gi. Ekwenye kwam na ife ikwu, ikpokota anyi ncha onu adiro mma chaa. cool
Re: Nrurita Uka (debate In Igbo Language). by AndreUweh(m): 10:49pm On Dec 05, 2010
Ndi oma m ji eme onu, unu mere ofuma na ihe unu dere.
Obibia ndi ocha na obodo anyi wetaara anyi ekpemekpe uka ogbaraohuru nke anyi na-ekpe ugbua. Udiri uka ha wetaara anyi mere ka ndi be anyi kwusi ikpere arusi, isekpuru osisi.
Re: Nrurita Uka (debate In Igbo Language). by NnamdiN: 11:17pm On Dec 05, 2010
Andre Uweh:

Ndi oma m ji eme onu, unu mere ofuma na ihe unu dere.
Obibia ndi ocha na obodo anyi wetaara anyi ekpemekpe uka ogbaraohuru nke anyi na-ekpe ugbua. Udiri uka ha wetaara anyi mere ka ndi be anyi kwusi ikpere arusi, isekpuru osisi.
o bukwa maka otu ekpemekpe ahu ka anyi ji kwa n'egbusi onwe anyi undecided
Re: Nrurita Uka (debate In Igbo Language). by grafikdon: 11:58pm On Dec 05, 2010
Andre Uweh:

Ndi oma m ji eme onu, unu mere ofuma na ihe unu dere.
Obibia ndi ocha na obodo anyi wetaara anyi ekpemekpe uka ogbaraohuru nke anyi na-ekpe ugbua. Udiri uka ha wetaara anyi mere ka ndi be anyi kwusi ikpere arusi, isekpuru osisi.

Mazi Uweh, dika Mazi NnamdiN siri kwuo, ekpemekpe ogbara ohuru so n'ihe na adoghachi anyi azu. Obughi na ebu m iwe na onuma n'obi ebe ekpemekpe ogbara ohuru di, kama na ihe na agba m ka akpi n'isi bu na ndi be anyi na eguzo n'azu ekpemekpe ogbara ohuru were na eme mpu n'aru, n'ihi ha kwenyere na Jesu Kristi ga agbaghara njo ha n'ile. Nke a mere iga ahu dinwe uno ebe oga ehi aka n'anya nyuo nsi n'ulo uka.

Ihe m choputara bu na ndi ogo mmuo (Nke ufodu ndi be anyi na ndi uka Kristi ji eme akaje) ka ndi uka ogbara ohuru were eze njo na aru, dika igwu ojoro, idina nwunye mmadu, ochu, inapu mmadu ihe ya n'ike were diri gabazie.

1 Like

Re: Nrurita Uka (debate In Igbo Language). by AndreUweh(m): 1:38am On Dec 06, 2010
Mazi Grafikdon, Mazi CninenyeN, Mazi Obiagu1, Mazi NnamdiN na ndi nruritauka ibem, udo diri unu. Unu dere ofuma. Uru obibia ndi ocha biara n'ala Igbo anyi baara anyi, adighi obere.
Tupu ndi ocha bia be anyi, anyi nwere ihe ana-akpo ohu. Ohu bu mmadu a zutara azuta na-eme ihe o bula a gwara ya ka o mee. A na-eji ohu ekpo ahihia n'ala Igbo mgbe ahu ma werekwa ya na-eficha ike. Anaghikwa ewe ya di ka mmadu ndi ozo. Onye o bula bu ohu anaghikwa eme ihe o bula onye abughi ohu ga-eme. Onye nwere ohu na eji ohu ya eme ihe masiri ya.
Mana obibia ndi ocha mere ka anyi ghotana ohu bu mmadu ibe anyi. Odighi ihe o bula di iche.
Re: Nrurita Uka (debate In Igbo Language). by aljharem(m): 4:11am On Dec 06, 2010
eze inigbo ofe
cheesy cheesy cheesy cheesy

boko ogini eze

bro yyeeyyy
Re: Nrurita Uka (debate In Igbo Language). by ChinenyeN(m): 4:41am On Dec 06, 2010
Obiagu1, ekweghi m na a kuziri anyi ka e si agu ede ma nka ma uzu. Ihe ndi a diri anyi tupu ndi ocha abia. Ya mere, sooso ihe ha mere bu ikpobatara anyi nke ha.

Andre, echere m na ihe anyi na-akpo "ohu" bu ihe ndi bekee na-akpo "indentured servants". A naghi enwe ohu enwe (dika ikwu si na o bu onye a zutara azuta). Kama, echere m na ohu bu onye na-akwu ugwo o ji madu. O nweghi slavery o bula o bu, ma nke ahu bu ihe m chere.
Re: Nrurita Uka (debate In Igbo Language). by NnamdiN: 6:41am On Dec 06, 2010
Mazi Uweh, Ilezie anya ofuma, I g'achoputa na obukwa otu ndi ocha ahu bidoro ahia izu ndi ohu. Anaghim asi na odighi uru ha bara anyi cha cha mana ebe munwa kwu, bu na o buru na ahapuru anyi n'onwe anyi, anyi kari igate aka karia otu anyi no ugbua. Otu uru m nwere ike ikweta ha bara anyi, bu ikwusi/mee ka ndi nna nna anyi kwusi ufodu omenala ojoo ndi mghe ochie.
Re: Nrurita Uka (debate In Igbo Language). by stranger: 7:13am On Dec 06, 2010
Ibo language is ugly,floreat! (No oofeinse)
Re: Nrurita Uka (debate In Igbo Language). by NnamdiN: 8:59am On Dec 06, 2010
Biko umunne m, gba onye ara batara ebe a nkiti, o wu a typical example of onye akwu oto tuwa nne ya ime.
Re: Nrurita Uka (debate In Igbo Language). by grafikdon: 11:10am On Dec 06, 2010
NnamdiN:

Biko umunne m, gba onye ara batara ebe a nkiti, o wu a typical example of onye akwu oto tuwa nne ya ime.

Hapu ndi ochonganoko, ofuduru obere ka m si akpi gbakwa ya n'akpa amu, mana ndi be anyi si na oburu na ichuwa onye ara ka inwude ya, kpoga ya ebe ana agwo ndi ara, obere oge onweghi onye ga amazi onye bu onye ara, ebe unu n'abo na agba mwemwe oso.
Re: Nrurita Uka (debate In Igbo Language). by NnamdiN: 11:58am On Dec 06, 2010
grafikdon:

Hapu ndi ochonganoko, ofuduru obere ka m si akpi gbakwa ya n'akpa amu, mana ndi be anyi si na oburu na ichuwa onye ara ka inwude ya, kpoga ya ebe ana agwo ndi ara, obere oge onweghi onye ga amazi onye bu onye ara, ebe unu n'abo na agba mwemwe oso.
Nwanne achigbuola m onwe m n'ochi, asusu anyi a atogbuola onwe ya. Chai!!!
Re: Nrurita Uka (debate In Igbo Language). by AndreUweh(m): 2:42pm On Dec 06, 2010
@Nwafo ChinenyeN: Ohu bu domestic slave. Ha enweghi ike igbaputa onwe ha. Mana obibia bekee mere ka ihe ndi di otua kwusi. Bekee mere ka anyi mata na o bu Chineke ke kwara ha ka osi ke ndi ozo.
Re: Nrurita Uka (debate In Igbo Language). by AndreUweh(m): 11:28pm On Dec 09, 2010
Ozo kwa, obibia ndi ocha mere ka igbu ejima laa. Tupu ndi ocha abia, nwanyi o bula muru ejima umu abuo n'otu mgbe mere aru. O bu umu abuo ahu o muru ka a na-akpo ejima. A ga-egbu umuaka ahu site n'ipigbu ha apigbu ma o bu kupu ha n'ajo ohia ebe mmiri na anwu ga-ano meela ha. Aga chupu kwa nne muru ha.
Ekele diri ndi ocha ka ha si kwushi ya.
Re: Nrurita Uka (debate In Igbo Language). by AndreUweh(m): 12:11pm On Mar 08, 2011
Igbo ndi oma m ji eme onu, Obibia ndi ocha nyekwaara anyi aka n'iwulite oru ugbo. Obibia ndi ocha mere ka anyi ghota na o bughi naani ogu na mma ka mmadu ga-eji ruputa erimeri. Ha mere ka anyi choputa na o nwere ihe a ga-eme ala achoghi imeputa nri ka o meta nri nke oma.
Re: Nrurita Uka (debate In Igbo Language). by ifyalways(f): 1:26pm On Mar 08, 2011
Threadia a amaka.  smiley
Obibia ndi ncho na uche ke m nwere uru na ogho m.
Ajuju m buzi.Ndi ocha a biago laa,ole otu ahu foro anyi ugbua?O buru na ndi ocha a biaghi,Ole ebe o di gi ka anyi(Ndi Igbo) ga ano ugbu a  undecided
Re: Nrurita Uka (debate In Igbo Language). by AndreUweh(m): 4:19pm On Mar 12, 2011
ifyalways:

Threadia a amaka. smiley
Obibia ndi ncho na uche ke m nwere uru na ogho m.
Ajuju m buzi.Ndi ocha a biago laa,ole otu ahu foro anyi ugbua?O buru na ndi ocha a biaghi,Ole ebe o di gi ka anyi(Ndi Igbo) ga ano ugbu a undecided
A si na ndiocha abiaghi, anyi agaghi enwe oganihu di ka anyi nwere ugbua.
Re: Nrurita Uka (debate In Igbo Language). by ifyalways(f): 6:11pm On Mar 12, 2011
Andre Uweh:

A si na ndiocha abiaghi, anyi agaghi enwe oganihu di ka anyi nwere ugbua.
Ya mere,O buru na ndi ocha abiaghi,anyi gara inokwa na ochichiri rute ugbu a undecided
Re: Nrurita Uka (debate In Igbo Language). by NnamdiN: 9:19pm On Mar 12, 2011
Andre Uweh:

A si na ndiocha abiaghi, anyi agaghi enwe oganihu di ka anyi nwere ugbua.
okwa ndi ocha matara ihe ha ma ugbua n'onwe ha? o nweghi onye kuziri ha, o buru na a hapukwara anyi, oganihu ga a bia, mana o nweziri ike i gbu oge.
Re: Nrurita Uka (debate In Igbo Language). by Onlytruth(m): 6:21am On Mar 14, 2011
Asi m kwuo, m g'asi na obibia ndi ocha biara rere isi n'abo. Na nkenke, obibia ha di mma, mana ochichi ha biara chia anyi adighi mma hoohaa! Asi na ha biara ka anyi na ha zurita ahia, makwa mekorita dika mmadu na ibe ya; odi mma.  cool

Mana ha biara were anyi ka anumanu; ha dum! angry Ma ndi uka, ma ndi nekwetaghi na chukwu n'ime ha. undecided

Ya mere ha jiri kpokota anyi na ndi di iche iche, dika ndi ugwu na ndi Yoruba tinye anyi n'otu obodo. Kamgbe ha jiri bia, soso ntu na aghugho ka ha ji were na achi. Oge ha lara, ha were ochichi nye ndi n'eti isi ala; ndi ha na ha luru ogu mgbe ochie anakpo crusade!angry  Biko, obughi aghugho ojoo di ihe ahu?

Ya mere, obibia ha di njo karia idi mma. Rukwa ugbu a, ha achoghi ikweta na obodo anyi agaghi aga n'ihu.
Re: Nrurita Uka (debate In Igbo Language). by ChinenyeN(m): 12:51pm On Mar 14, 2011
Andre, otu ihe ndi ocha si maa gi nma ehn. .  amaghi m, ma mu onwe m agaghi ekwe na nke a.

1 Like

Re: Nrurita Uka (debate In Igbo Language). by ifyalways(f): 4:54pm On Mar 14, 2011
NnamdiN:

okwa ndi ocha matara ihe ha ma ugbua n'onwe ha? o nweghi onye kuziri ha, o buru na a hapukwara anyi, oganihu ga a bia, mana o nweziri ike i gbu oge.
Ihe a bu ihe uche m gwara m.
Ebe onye oso ruru,onye ije ga erukwa ebe ahu.

Ndi ocha bu anyi uzo mepe anya,ga n'iru na nka na uzu,anyi onwe anyi jikwa nwayo nwayo na aga nke anyi.
Kama ihe bu ujom bu na ndoro-ndoro,tigbuo -zogbuo na anya ukwu ga abu ogbachi nye anyi.
Obibia ndi ocha hapuru anyi ka ohu(slave) na nwa na anwu ara . . . .O nweghizi ihe anyi puru ime.Ihe o bula anyi meputara,o buru na o bughi nkwado ma o bu akara ndi ocha,o gaghi aga ahia ma obu akpo ya Aba-made angry

Nkporogwu na ahiha anyi ji eleta onwe anyi anya tupu ndi Ocha abia,kedu ebe o no ugbua?
I nwa anwa tunyere mmadu alo(suggest) ka o nwuo mmiri dogonyaro maka Iba ya o si gi tufia,I choro i gbu ya . . . sad

A na m aju,Kedu otu o kara idi anyi Ugbua ma o buru na Ndi ocha abiaghi undecided
Re: Nrurita Uka (debate In Igbo Language). by AndreUweh(m): 7:06pm On Mar 16, 2011
ChinenyeN:

Andre, otu ihe ndi ocha si maa gi nma ehn. . amaghi m, ma mu onwe m agaghi ekwe na nke a.
Akwa i ma na eziokwu bu ndu.
Re: Nrurita Uka (debate In Igbo Language). by AndreUweh(m): 7:11pm On Mar 16, 2011
Onlytruth:

Asi m kwuo, m g'asi na obibia ndi ocha biara rere isi n'abo. Na nkenke, obibia ha di mma, mana ochichi ha biara chia anyi adighi mma hoohaa! Asi na ha biara ka anyi na ha zurita ahia, makwa mekorita dika mmadu na ibe ya; odi mma. cool

Mana ha biara were anyi ka anumanu; ha dum! angry Ma ndi uka, ma ndi nekwetaghi na chukwu n'ime ha. undecided

Ya mere ha jiri kpokota anyi na ndi di iche iche, dika ndi ugwu na ndi Yoruba tinye anyi n'otu obodo. Kamgbe ha jiri bia, soso ntu na aghugho ka ha ji were na achi. Oge ha lara, ha were ochichi nye ndi n'eti isi ala; ndi ha na ha luru ogu mgbe ochie anakpo crusade!angry Biko, obughi aghugho ojoo di ihe ahu?

Ya mere, obibia ha di njo karia idi mma. Rukwa ugbu a, ha achoghi ikweta na obodo anyi agaghi aga n'ihu.



I ji ezigbo okwu. Ma marakwa na enwere inter-group relations tupu ndi ocha abata. NdiIgbo na ndi ozo na emeko kwa site na uzo di iche iche. O bu ihe ndi di otu a ka bekee huru mere ha ji kpokota anyi di ka otu.
Re: Nrurita Uka (debate In Igbo Language). by AndreUweh(m): 11:23pm On Jun 27, 2011
Tupu Bekee a bia na Alaigbo, NdiIgbo na eji ukwu (okpa) eje njem. Njem ndia na ete anya tupu ha agaruo ebe ha na eje. Hana esikwe na etiti ohia ebe anumanu ndi di iche iche juputakwara. Ufodu umu anumanu ndia na egbu mmadu.
Mana ugbua site na obibia nwa bekee, uzo sakwara mbara, ha ruputakwara ugbo-ala eji eme njem. Ugbua, isite Enugwu na eje Potakot na ewe awa ato. Mana na oge mbu, o ga bu abali ato.

(1) (2) (Reply)

The Acculturuation Bewteen Midwestern And Eastern Nigerian Cultures. / What's The Literal Translation Of (north, South, East, West) In Your Language? / Which Igbo Dialect Do You Like The Most

(Go Up)

Sections: politics (1) business autos (1) jobs (1) career education (1) romance computers phones travel sports fashion health
religion celebs tv-movies music-radio literature webmasters programming techmarket

Links: (1) (2) (3) (4) (5) (6) (7) (8) (9) (10)

Nairaland - Copyright © 2005 - 2024 Oluwaseun Osewa. All rights reserved. See How To Advertise. 51
Disclaimer: Every Nairaland member is solely responsible for anything that he/she posts or uploads on Nairaland.