Welcome, Guest: Register On Nairaland / LOGIN! / Trending / Recent / NewStats: 3,207,772 members, 8,000,240 topics. Date: Tuesday, 12 November 2024 at 06:14 AM |
Nairaland Forum / Nairaland / General / Culture / Ikemba! N’ezi Okwu, Ọnwụ Amaghị Dike! (1199 Views)
Mrs Dike An Igbo Citizen To Become The First Female OBA In Yoruba / Akpaala Okwu (idioms). / Okwu Ntabi Ile (2) (3) (4)
Ikemba! N’ezi Okwu, Ọnwụ Amaghị Dike! by ONAIgbo: 10:10am On Nov 28, 2011 |
Ikemba! N’ezi Okwu, Ọnwụ Amaghị Dike - ONAIgbo Ikemba! Ike Igbo jiri were jee mba! Dike ka Ị bụ! Mana lezienụ anya, ọnwụ amaghị dike. Ọ bụrụ na ọnwụ ma dike, ọ gara ahapụ gị ka Ị dịrị Igbo ndụ. Chei! Ọkwa ihea mere Igbo jiri baa aha sị: Ọnwụamadike! Ọnwụamaeze! Ọchịagha! Ị nụrụ ọgụ Igbo ka dimkpa, mana lezịenụ, anaghị eje ọgụ na be mụọ: anyị gara eje enye aka na yabụ ọgụ gịna ọnwụ lụrụ. Igbo bara aha sị, Ọnwụatụche! Ọ bụrụ na ọnwụ na atụ uche, ọ gara atụ uche nke ọma, were hapụ gị, nihi na Ị dị Igbo nkpa! Ikemba, Ị bụ egwu, anatụgị atụ, mana lezienụ, Ọnwụatụegwu! Ya mere ọnwụ jiri nwee obi, were gbụe “egwu” dịka gị. Igbo na ebezị arịrị, nke gosiri n’ezie, na Ọnwụjiarịrị. Ọnwụ, gịnị mere na ị naghị anụ biko? Na agabnyeghị na anyị sịrị gị, Ọnwụbiko, Ị kachiri ntị na egbu Igbo ka ha gwụ. Ọ bụrụ n’onwere ihe ọjọọ anyị mere gị, ọkwọ anyị sị, Ọnwụghara? Werekwa rịọ sị, Ọnwụegbula! Ị jụrụ na ị gaghị agha were na egbu otu osiri masị gị. Ọnwụ, ọbụgịnị na ewe gị? Ọ bụrụ maka nanyị sịrị na Ọnwọdịnjọ, ọkwa anyị kpupuru gị okpu were sị na Ọnwụka? Echere m na anyị rịọrọ gị arịrịọ sị Ọnwụchekwa? Anyị nyere gị nsọpụlụ sị, Ọnwụkwe. Odoola ewu na ọkụkọ anya, n’ijụrụ ikwe, ma jụkwa icherenụ. Anyị kwetazịrị na iga egbu, were rịọ sị Ọnwụgbufọ, mana ọdịka ịchọrọ igbukpọ Igbo. Azụ erụọla dike ala: Ikemba alala mụọ. Ọnwụdera, odego! Anyị sịgodu, Ọnwụzuruike, ọ gaghị ekwe izu ike. Igbo bụ Igbo, hichanụ anya miri. Nihi na Ọnwụzurumba! Ọnwụzuruigbo! Ọnwụzuruụwa. Ikemba! Nma nma!. Otu Nzụpụta Asụsụ Igbo (ONAIgbo). |
Re: Ikemba! N’ezi Okwu, Ọnwụ Amaghị Dike! by ONAIgbo: 10:08pm On Dec 04, 2011 |
[size=16pt]Otu Nzọpụta Asụsụ Igbo [/size] (ONAIgbo) Nke a Bụ Ọkwa Dị Ezigbo Nkpa, nke sitere n'aka ndị ONAIgbo. Igbo bụ Igbo, ekelee m ụnụ. Ọ bụ oke ihe nwute na anyị hapụrụ asụsụ anyị, o wee na achọ ila n’efu . Ọkwa mba dị iche iche na asụ asụsụ ha? Asụsụ ndị Bekee dịrị ha, nke ndị Japanụ dịrị ha. Ndị Chaina, ndị Fụrenchị, nakwa ndị Ndia na asụgbado asụsụ ha n’otu n’otu. A bịa na obodo Naijiriya, asụsụ ndị Yoruba dịrị ha, nke ndị Awụsa dịrị ha. Ndi Ịjọ n’asụ be ha, ndị Tivi nakwa asụ be ha. Igbo bụ Igbo bikonụ, a sịrị m ka m jụọ; gịnị mere asụsụ anyị? Kedụ ka anyị ga esi na aza ndị Igbo, mana anyị amaghị Igbo asụ? Igbo bụ Igbo, ọ bụrụ na anyị ejighị ehihie were chọọ ewu dị oji, ọbụ na chi jie ka anyị ga achọtanwu ya? Igbo na aba aha sị, AHAMEFỤLA! Ndị asụsụ ha furu efu, bụ ndị aha ha furu efu. Ọ bụrụ na asụsụ Igbo fue, ndị Igbo efuela! Chineke ekwela ihe ọjọọ. Ọ ga ajọgbu udele na njọ, ma sigbukwa nkakwụ na isi, ma ọ bụrụ na anyị hapụ asụsụ anyị ka ọ nwụọ. Ọ na bụ m hụcha, edemede ụfọdụ a na edezi ugbua na aha asụsụ Igbo, anya miri anachọzị ịgba m. Echekwara m na anyị bụ ndị nwere akọ na uche? Biko nụ, ka anyị were otu obi, were nebaokwua anya. ONAIgbo (Otu Nzọpụta Asụsụ Igbo), bụ otu ndị ihe gbasara ya bụ ajọ ọnọdụ asụsụ anyị nọ ugbua na e metụ n'obi rinne. Na mgbe na adịghị anya, anyị ga eme ka ụnụ mata atụmatụ nakwa ebu m n'obi anyi gbasara ihe anyị nile ga eme, ka asụsụ anyị were dikwa ndụ ọzọ. Ndewo nụ! ONAIgbo kwenu! Igbo bụ asụsụ ọma! ONAIgbo kwenu! Asụsụ anyị ga adịrị anyị!. Igbo kwezuenu! Ọ gadịrị Igbo nma. Kwado ONAIgbo. Kpọtụrụ anyị na: Igwe nkparị ụka (Kpọọ anyị ma ọbụ zitere anyị edemede): 0810 483 5458 (ngwụ, asatọ, otu, ngwụ, anọ, asatọ, atọ, ise, anọ, ise, asatọ) Detara anyị ozi na "onaigbo@yahoo.com". Anyị nọkwa na Akwụkwọ Ihu (http://www.facebook.com/ONAIgbo) |
Re: Ikemba! N’ezi Okwu, Ọnwụ Amaghị Dike! by JamesDoe: 10:12pm On Dec 04, 2011 |
Violation of Nairaland "English only" rule. Admins and moderators take note. If we all start speaking in our mother tongues then let's call it a day. |
Re: Ikemba! N’ezi Okwu, Ọnwụ Amaghị Dike! by odumchi: 2:41am On Dec 06, 2011 |
Actually, you are free to write in whatever language you please in the culture section. However, you do have a point. His point would get across to more people if it was translated in English. However, his topic is really about preserving the Igbo language, so I guess typing it in English defeats the purpose. |
Re: Ikemba! N’ezi Okwu, Ọnwụ Amaghị Dike! by JamesDoe: 9:10am On Dec 06, 2011 |
It was initially in the Politics section and has just been moved to the Culture section. So, your point above is now correct. I wasn't seeking to offend just that if we all start posting in our mother tongue in the Politics section, it would be Babylon! |
(1) (Reply)
Why Do People Wear Tattoo? / What Year Is It In Your Ethnicity? / A MUST READ -do You Remember Any Of This?
(Go Up)
Sections: politics (1) business autos (1) jobs (1) career education (1) romance computers phones travel sports fashion health religion celebs tv-movies music-radio literature webmasters programming techmarket Links: (1) (2) (3) (4) (5) (6) (7) (8) (9) (10) Nairaland - Copyright © 2005 - 2024 Oluwaseun Osewa. All rights reserved. See How To Advertise. 14 |