Welcome, Guest: Register On Nairaland / LOGIN! / Trending / Recent / New
Stats: 3,178,764 members, 7,905,839 topics. Date: Tuesday, 30 July 2024 at 07:24 PM

Igbos come show your proverbs skills - Culture (23) - Nairaland

Nairaland Forum / Nairaland / General / Culture / Igbos come show your proverbs skills (283522 Views)

Nigeria Pidgin Proverbs & Their Meanings / Igbos come show your proverbs skills - (Part 2) / Yorubás come show your proverbs skills (2) (3) (4)

(1) (2) (3) ... (20) (21) (22) (23) (24) (25) (26) ... (101) (Reply) (Go Down)

Re: Igbos come show your proverbs skills by echelon(m): 12:13pm On Sep 15, 2007
Ndi be anyi na-asi na

Onye ajulu anaghi aju onwe ya
He that is rejected does not reject himself

Agbu ekelu nwa ngwere erugo otuto
It's time for the lizard to be unbound

Anya kwaba, imi akwaba
When the eye starts crying, the nose follows suit

Kachaanu
Re: Igbos come show your proverbs skills by echelon(m): 5:45pm On Sep 15, 2007
A na-asị na

Ọkpụkpụ okenye dị nkọ
An old man's bones are sharp

Onye anakwana nwata ukpana ya maka na o dị anụ
Let no one take a child's grasshopper from him just because it's meaty

Nwoke nụsia ọgụ, nwanyị enwelụ akụkọ
When a man is through with the battle, the woman tells the story

Nke onye na-eme ya gaziere ya
Re: Igbos come show your proverbs skills by presido1: 9:10pm On Sep 15, 2007
onye too ilu nnaya turu ya kwukwa ugwo nnaya ji.

Nwata bulie nnaya elu ogodo sachie ya anya.

ka m biakwa nu.

1 Like

Re: Igbos come show your proverbs skills by echelon(m): 9:14pm On Sep 15, 2007
presido1:

onye too ilu nnaya turu ya kwukwa ugwo nnaya ji.

an interesting one!
Re: Igbos come show your proverbs skills by presido1: 9:19pm On Sep 15, 2007
ya obu maka
nwata ga eto eto wara ogodo,ogodo asachie ya anya.
eche ke kwa nu.
Re: Igbos come show your proverbs skills by echelon(m): 9:22pm On Sep 15, 2007
@topic

Ọkụkọ rapụ kwọm kwọm, ọ were gịnị zụọ ụmụ ya?
If the fowl stops making the noise "kwom, kwom", with what will it use to feed its chicks?

Ahia bu ahia, nne na nwa na-azu
Trade is trade, mother and child transact used to say that business shld be separated from pleasure or family

Otu osisi anaghị eme ofịa
A single tree does not constitute the forest

@presido1

A nọkwa m mma. Kedụ ka eke si anya anwụ?
Re: Igbos come show your proverbs skills by presido1: 9:40pm On Sep 15, 2007
nwanne obu kwa ntughari ntughari.
ana m akwado iga ehi ura. ndi igbo si enweghi ihe dika elo oru asi ghosiba ose.
Re: Igbos come show your proverbs skills by echelon(m): 9:47pm On Sep 15, 2007
Ngwanụ, ka chi foo.

Ka ọdị echi
Re: Igbos come show your proverbs skills by echelon(m): 12:21pm On Sep 16, 2007
@topic

Onweghi ihe anya huru gbaa obara
There is nothing the eyes will see that will make it to shed blood

Onye ara na uche ya yi
The mad man has his own thoughts

Ogaranya chie eze, o laa n'ikpo aku
When the rich is coronated as king, he enters into the world of wealth

and here is a long one,

Atulu si na o bu eziokwu na o maghi agba egwu ma akuru egwu gafeta n'ama nna ya, o maghi ihe o ga-eme, o wulibe elu
The sheep said that inasmuch as she does not know how to dance but if the musicians pass infront of their house and she does not know what to do, she will start jumping up.
Re: Igbos come show your proverbs skills by echelon(m): 10:53pm On Sep 17, 2007
Onye bu mmadu uzo sibe ite na-aka ya enwe mkpo mkpo ite
He that started cooking before another has more broken earthen pots than the other this talks of the importance of experience

Obughi otu aku inu si ada n'onu ka o si ato
The bitter kola does not taste as it sounds when being chewed  grin

Onye aririo ka onye ori mma
The begger is better than the thief but why beg in the first place?
Re: Igbos come show your proverbs skills by echelon(m): 4:01pm On Sep 19, 2007
@topic

Ngwugwu a ga-ato ato adighi mma ka a na-enyo ya enyo
The parcel that will be opened needs not be peeked at

Emee nwata ka emere ibe ya, obi adi ya mma
When a child is treated as his mates, he becomes happy

Ozu nwada to n'uzo, o gbaa n'afa
If a daughter's corpse is not brought home to the family, it will show at the fortune tellers'

I'm feeling lonely in here y'all
Re: Igbos come show your proverbs skills by osisi5: 11:40pm On Sep 19, 2007
awwwwwwwwwwwwww.
Chukwu gozie gi
Re: Igbos come show your proverbs skills by faketan(m): 11:52pm On Sep 19, 2007
Ndi be anyi na-asi na nke onye chiri, ya zaa. . . .Ufodu na-aza ome n'uko aku. echelon, I bu ome n'uko mmadu. I meela mgbe uko mmadu koro na threadia. Daalu. . .Okwanu ihe onye na-eme ka e ji ama ya. nwankita si na onye a na-akpo nwerir ihe o na-eme. Echelon Imeela thredia ka oburu uzo mmiri na abughi uzo nku. Uzo nku na-echi echi, ma n'uzo mmiri adighi echi echi.

Okuko a na-echfukwanu onye foro ya odu n'udu mmiri? mbanu. Jide ka iji n'ihi na o na-abu nwa ewu na-ata agbara, nwa ya a na-ele ya anya n'onu. Okwa ewu na-adighi ata ji sor nke na-ata, o bido foputawa ji n'ala.

Jisie ike n'ihi na ejighi ututu ama njo. Ogwula m n'onu ugbua.
Ka chi foo
Re: Igbos come show your proverbs skills by echelon(m): 5:39pm On Sep 20, 2007
+osisi:

awwwwwwwwwwwwww.
Chukwu gozie gi

Believe it or not, thats my middle name

Daalunu faketan na +osisi. Ma ka m jukwa oo, ilu igbo enwere ike igwusi? O dikwa ka ilu anyi agwulaoo!
Re: Igbos come show your proverbs skills by toshmann(m): 5:50pm On Sep 20, 2007
mu wa bu toshmann nwa mama, a ma m ihe m na eme, mana amaghi m ihe n'eme m.

(i know wetin i dey do, but i no know wetin dey do me)
Re: Igbos come show your proverbs skills by faketan(m): 10:09pm On Sep 20, 2007
Nze bu na nwa o na buzikwagi na-ekwu ihea. mbanunu, ilu igbo agaghi agwu. Imakwa ekwekwe na-ekwere n'ute ekwere.
I makwa na ngwere niile bu mmakpu mmakpu ma onweghi onye ma nke afo na-aru.

Egbe si nwa ya ka oje chota ihe ha ga-eri. O je buta nwa obogwu lata. Nne ya si ya kedu ihe nne obogwu mere, osi ya na nne ya ekwughi okwu. Nne egbe si ya ya bughachi nwa ya n'ihi na ihe o ga eme di ya n'uche. Olata buru nwa okuko, O si ya kedu ihe nne ya kwuru, O si ya na nne bere fere chuwa ya, ma na-eti mkpu. O is ya nwa m, rie nri n'ihi na o mechago ihe O ga-eme. I he anyi ga-ekwu di anyi n'uche.

Ihe osokwara gi saa nkakwu ahu, werekwa ncha masiri gi saa ya ahu, O ga na-esi isi n'ihi na ihe O ji esi isi di ya nahu.

Ilu Igbo di igbo nime.
Re: Igbos come show your proverbs skills by echelon(m): 7:39am On Sep 21, 2007
toshmann:

mu wa bu toshmann nwa mama, a ma m ihe m na eme, mana amaghi m ihe n'eme m.

(i know wetin i dey do, but i no know wetin dey do me)

Bia tosh, nke o bukwu ilu? Ana m aju ajuju o maka na-asi na onye ajuju anaghi efu uzo grin


Onye biri ka ibe ya biri, okenekwa

@topic

Ka o rana, ewetaghi onwe ya
No matter the size of something, it does not come by itself

O bu otu nne na-amu ma o bughi otu chukwu na-eke
Its one mother that gives birth but not one god that creates. actually means that though siblings are from the same mama, their personalities are different

Onye na nwanne ya yii, ujo a na-atu ya?
Who is with his sibling and is still afraid? this is used to say that you still got enemies among your relations.
Ndi be anyi noro nu juu
Re: Igbos come show your proverbs skills by echelon(m): 7:41am On Sep 21, 2007
toshmann:

mu wa bu toshmann nwa mama, a ma m ihe m na eme, mana amaghi m ihe n'eme m.

(i know wetin i dey do, but i no know wetin dey do me)

Bia tosh, nke o bukwu ilu? Ana m aju ajuju o maka na-asi na onye ajuju anaghi efu uzo grin


Onye biri ka ibe ya biri, okenekwa

@topic

Ka o rana, ewetaghi onwe ya
No matter the size of something, it does not come by itself

O bu otu nne na-amu ma o bughi otu chukwu na-eke
Its one mother that gives birth but not one god that creates. actually means that though siblings are from the same mama, their personalities are different

Onye na nwanne ya yii, ujo a na-atu ya?
Who is with his sibling and is still afraid? this is used to say that you still got enemies among your relations.

Ndi be anyi noro nu juu
Re: Igbos come show your proverbs skills by faketan(m): 12:42pm On Sep 21, 2007
Tosh e jighi Okwu nwanne m hapu ya.
Re: Igbos come show your proverbs skills by echelon(m): 12:56pm On Sep 22, 2007
Ndi be anyi na-asi na

Onye a na-eduga n'ama na-ebu uzo
He that is being accompanied to the bush to poo poo leads the way

Onye aghogbuu ka agbaa
He that is deceived is he that is won

Onye kwuo na ihe na-ato uto, ya kwuo ihe o na-ato ka ya
He that says that something is del.li.ci.ous should also say what it tastes like

and of course, you know that,

Obughi onu ejiri bite aku ka eji akwu ya
It's not the courtesy that money was borrowed that it's paid back

n'ikpe azu,

Mgbe otu onye isi di mma kporo ndi ara iteghete gafee, ihe anyi ma bu na ndi ara iri gafere
When a sane dude leads nine mad men across, what we know is that ten madmen have passed.

Ndi be anyi okenekwa, nke onye chiri ya zere.
Re: Igbos come show your proverbs skills by echelon(m): 7:07am On Sep 24, 2007
@topic

Ebe nwanza na-eriju afo ka a na-ebuta ozu ya
The place where the "nwanza" (a bird) feeds sumptuously is where its corpse is found

Asiri fee izu, o febe efe
When gossip lasts for a week, it starts flying

Onye tara amu ebune ji ibi ugwo
Whosever eats the genitals of a ram will have inflammation on his own genitals

Okuko otuto toro n'onu nwere ka o si atu ife
The chicken that has boil on its beak has a way it pecks at things

Onye nwere nti ya nuru
Re: Igbos come show your proverbs skills by darfur(m): 11:18pm On Sep 24, 2007
echelon:

Onye nwere nti ya nuru

onye n'enweghikwanu nti?
Re: Igbos come show your proverbs skills by echelon(m): 2:15pm On Sep 25, 2007
darfur:

onye n'enweghikwanu nti?

Onye na-enweghi nti ya gbado aka n'ukwu.akimbo Asi na a na-agwa nti ma nti anughi, mgbe egbupuru isi, nti esoro ya  grin


Okenekwa
Re: Igbos come show your proverbs skills by presido1: 10:14pm On Sep 26, 2007
asi na anya bewe ime bewe.
aturu gbapia ala ifufe oto kara ya mma.

i dee come
Re: Igbos come show your proverbs skills by echelon(m): 12:43pm On Sep 28, 2007
@topic

Ndi be anyi si na,

Nwa ewu ga-esekpuriri ani wee nuo nne ya ara
The kid must kneel down to suck the nanny goat's breast

Nne ewu na-ata agba, nwa ya a na-ele ya anya n'onu
When the nanny goat chews the cud, the kid looks at her mouth

Nwoke adighi ka o na-adi, O naghi eme ka o si eme
When a man is not as he used to be, he does not do as he used to do
Re: Igbos come show your proverbs skills by echelon(m): 10:09am On Oct 01, 2007
Ndi be anyi kee kwanunu? Happy independence to y'all. Obu olile anya anyi na agbomafo ofu a ga-ewetara anyi niile oganiru.

@topic

Uto na-adi mma na njeluta
Friendship is always better from a distance english equiv:over-familiarity breeds contempt

Ura toba uto, ekwoba ya ekwo
When the sleep becomes sweet, snoring starts

Ura felu izu aburula onwu
The sleep that lasted one week has become death

Ije uwa bu onye na-eje, o na-ekepre chi ya
The world affairs is as you go, you keep praying to your God

Dibia gwolu ozo, ozo gbulu

Who can help translate the last one?
Re: Igbos come show your proverbs skills by echelon(m): 7:26am On Oct 02, 2007
@topic

M ga-agba oso mmiri ka o ka di n'obu ukwu
I will run away from the flood when the level is still at the ankles

Anaghi agba aka achu ihe na-ata alu
You don't pursue something that bites with bare hands

Oru furu ibe ya ka eji mbazu eli ya mara na o bu otu o ga-adi ya[/color][color=#990000][/color][color=#990000]
The slave that saw a fellow slave being buried with a spade should know that he will end up like that

Okenekwa
Re: Igbos come show your proverbs skills by echelon(m): 7:16am On Oct 03, 2007
Kedu kwanunu?

@topic

Ejighi enyo ele ife agba n'aka
You don't view something you are wearing on your hand with a mirror

Okwute lia enu, ujo ejide ite
When the stone climbs up, the pot becomes afraidunderstandably cos it could get broken

Agbaghi uzo owere mgba, o dighi echi
If you don't fight against the apian way, it will not close

at last, my repertoire is exhausted. but not to worry, i've ordered my igbo notebooks to be sent to me as i said i would

BTW where are the others?

Ka o digodu
Re: Igbos come show your proverbs skills by echelon(m): 8:02am On Oct 05, 2007
here is one i heard recently

Onye gbulu nwanne ya abughi dike
He that killed his sibling is not a warrior
Re: Igbos come show your proverbs skills by echelon(m): 2:38pm On Oct 06, 2007
Ndi be anyi na-asi na

Onye ji afo mmadu ji onu ya!
He that has someone's stomach has his mouthmeans that nobody can be financially dependent and be free. i now understand my propensity to acquire wealth

Nku di na mba na-eghere mba nri
The firewood in a foreign land gets the food done for them

Odi be ndi diri ha
Let what exists at a foreign land be theirs

Onye bulu chi ya uzo o gbagbuo onwe ya n'oso
When you go ahead of your God, you will run and be wearyreminds me of Isaiah 40:31

Jisienu ikeooo
Re: Igbos come show your proverbs skills by youngies(m): 12:13pm On Oct 09, 2007
Echelon

You have shown without any doubt that you are a true Igbo man, you certainly know the language and its idoms.

I thank you very much for holding forth for me while I was away on my vacation, now I am back.

Ndewoooo! Asi na ekene dike na nke o melu, o me kwa ozo
Greetings! Our fathers says that when a man is praised for what he has done, he will do more
Re: Igbos come show your proverbs skills by ifyalways(f): 10:05pm On Oct 09, 2007
agadi nwayi da ada ugboro abuo nke ato o guo ihe o bu na ukpo onu(when you fall twice and then thrice,its better to look inwards for solution)mbe a naghi agba oso ehihe na efu(nothing happens for nothin)e me ngwa,e meghara o dachi(earliness prevents sad stories)

(1) (2) (3) ... (20) (21) (22) (23) (24) (25) (26) ... (101) (Reply)

African Weddings From All Over! / Keggites Members : Introduce Yourself & Ilya / Yoruba Idioms: Owe Yoruba, Itunmo Re Ati Lilo Re

(Go Up)

Sections: politics (1) business autos (1) jobs (1) career education (1) romance computers phones travel sports fashion health
religion celebs tv-movies music-radio literature webmasters programming techmarket

Links: (1) (2) (3) (4) (5) (6) (7) (8) (9) (10)

Nairaland - Copyright © 2005 - 2024 Oluwaseun Osewa. All rights reserved. See How To Advertise. 54
Disclaimer: Every Nairaland member is solely responsible for anything that he/she posts or uploads on Nairaland.